Mwakpo, ndị Ọgbakọ 0tu RC, na ịrụ ọrụ iji wuo ezi uche ọha mmadụ

 (edegharịrị maka ọgbakọ nke aga eme tupu eme ọgbako mba ụwa)

~~Tim Jackins

Anyị nile enwetụla onye e chetere ihe ojoo mere ya nke mere ka ha kpaso anyị agwa ọjọọ. Maka na anyị enweghị ohere wepụ nhụjuanya sitere na ihe ndị a, enwere ike ịhe ndekọ ndi ahụ anyị gukobara na ewepughi nwere ike mee ka anyi chekwa ọzọ na a na -emeso anyị ihe ọjọọ, ma obu eziokwu ma ọbụghi. Nkea nwere ike igbochi echiche anyị nke ukwuu nke ga eme na anyị nwere ike nwee nsogbu ịhụ nke bụ eziokwu na ọnọdụ anyi nọ na ya mgbe ahụ wee mezia ka anyị meso ndị mmadụ omume ekwesịghị ha n’uzọ dị njọ.

Mgbe ọnye echetere mmegide emere ya na agba mbọ ịta mmadụ ụta maka mmegbu ma n'otu oge ahụ na agba mbo ịme ka ndị ọzọ sonyere ha n'omume ahụ, anyị na akpọ ya mwakpo. Mwakpo karịrị ịkatọ mmadụ ma ọ bụ igosi iwe, ọ gụnyere nhazi na imegide ha. Mwakpo na ebugharị uche anyị niile ma bụrụkwa ihe ịma aka n'ụzọ esi eneba ya anya ka oghara ịgbagwoju ndi mmadụ anya ma ọ bụ mebie ọrụ anyị.

 Nkwenye anyị bụ na mwakpo na esitekarị na ncheta mmegide kama ezi echiche, ọbụlagodi mgbe enwere ihe kpatara ikpughe nsogbu

 Usoro amụma anyị maka ijikwa mwakpo

 Anyị ewepụtala iwu na ọgbakọ RC maka ijikwa mwakpo na idozi mmejọ. Ọ gụnyere ịchebiri na ịkwụsị mwakpo ngwa ngwa -maka na mwakpo dabere na mkpaligharị ihe iwe na abụghị ọnọdụ dị ugbua ma bụrụ ihe mgagwoju anya nye ndi ọzọ mee ka ahapụ ịche echịche dị mkpa iji dozie ezigbo nsogbu ọ bụla.

 Anyị achọpụtala na ihe ndị a na -enye ndị mmadụ ohere ka ha na -ejikọ dika ana-ejikwa mkpalighari iwe ma na agba mbọ imezie mmejọ ọ bụla: (1) ngwa ngwa kwusị mwakpo, (2) jiri ndụkọrita kwusị mkpalighari n'akụkụ niile yana mmejọ ọ bụla emere, (3) ikwupu ma iwepụ nhụjuanya, na (4) ịrịọ mgbaghara ma mezie nsonaazụ nke njehie ọ bụla.

 Amụma a gbadoro ụkwụ na nkwenye na anyị enweghị ndị iro mmadụ kama amaghị mejọọ yana usoro iwu na emebi ihe na n’eso makana nhụjuanya site na mmerụ ahụ gara aga nwere ike ịgwaghari ma megharịa echiche anyị; na anyị nwere ike ịgbake site na ihe mgbu gara aga na agaghịzi eduhie ha. Anyị achọpụtala na iwu a na -arụ ọrụ nke ọma. Ọkwesiri ka onye ọ bụla jisike tinye uchu kwupu ma wepụ ihe mkpagbu ya na nsogbu ndị metụtara ya, agbanyeghị etu ha siri dị. Mgbe ahụ enwere ike nweta mkpebi, dị ka mwepụ iwe na -enye ohere ka ọnye ọbụla hụ ọnọdụ anọ na ya nke ọma

Amaghị mejọọ

 Enwere okwu nke mwakpo yana okwu mmejọ. N'ihi mkpalighari iwe, ihe ndịa nwere ike inwe mgbagwoju anya n'uche ndị mmadụ. N'etiti mkpalighari ahụ, ndị mmadụ anaghị enwe ike ịkọwa [nghọta] ngwa ngwa ma ọ bụrụ na amaghi mejọ ha.

Mwakpo na mmejọ dị iche iche, ọ dịkwa anyị mkpa idobe ha iche n'uche anyị. Enwere ike nwee mwakpo nke gụnyere ihe adịghị mma; na mwakpo na -etinyeghị mmejọ ọ bụla, naanị mkpaligharị iwe.

 Anyị ga emejọ na akpachaghị anya; anyị ga na emejọ amaghị ama mgbe niile. Ka ihe na -esiwanye ike na ọha mmadụ, ọ ga -adị anyị mkpa ịga n'ihu nwalee ihe ndị anyị na -anwalebeghị na mbụ - nke ahụ pụtara na anyị ga -emehie ihe. Amaghị mejọọ apụtaghị na anyị bụ ndị ajọ omume, ndị na -erughị eru, maọbụ ndi nke aga atufuu. Ọ pụtara naanị na anyị amaghị mejọọ. Ka anyị na -anwale ihe ọhụrụ ma nweta ozi ọhụrụ, ọ dị anyị mkpa ịmata mmejọ anyị na -eme, na –ekwupu ma wepụ ha nke ọma nke na a gaghị adọta anyị ime ụdị ihe ahụ ọzọ, wee jiri ozi ọhụrụ wee gaa n'ihu.

 Ụzọ ịga n'ihu bụ ịga n'ihu na -anwale ihe, ọbụlagodi na anyị mehiere. Nke a na -enyere anyị aka ịmụta ihe, na -enyere anyị aka ikwurịta okwu, na -enyere anyị aka irute ọtụtụ mmadụ. Ụzọ ịga n'ihu abụghị ka anyị na akpachapụ anya nke ukwuu ka anyị wee hara ịmejọọ. Ọtụtụ n'ime anyị atụọla egwu nke na anyị anaghị anwale ihe karịa ma anyị nwere ike ime ya nke ọma; anyị na atụ egwu mkpọtụ na -abịakwute anyị site na nkpaligharị ndị ọzọ. Mmejọ bụ akụkụ nke mmụta, anyị ga -amụtakwa mmụta ahụ n'agbanyeghị na mmejọ anyị nwere ike bụrụ ihe ndabere maka mwakpo.

 Ọ bụrụ na anyị anaghị ekwupụ ma wepụ ebe anyị mehiere, anyị agaghị enwe ike ijikwa mwakpo nke ọma. Mwakpo ahụ ga akpaligharị iwe nke anyị, anyị agaghị enwe ike iche echiche nke ọma n'ịzaghachi ha. Anyị nwere ike ịhụ onwe anyị ebe anyị na achọ ịrịọ mgbaghara maka ihe ndị anyị na -emeghị, iji mee ka mkpaligharị iwe ndị mmadụ kwụsị; ma ọ bụ gbachitebere onwe ya; ma ọ bụ na -achọ ị hapụ okwu ahụ kpamkpam. Ọ dịghị nke ọ bụla n'ime azịza ndị a na -echebara echiche. Anyị chọrọ inwe ike iche echiche mgbe mwakpo mere.

 Mwakpo na ihe ọna ebute

 Mwakpo abụghị naanị ọnye bidoro ya maọbu ọnye akwadoro ịwakpo ka ọna emetụta kama ọ na akpalikwa onye ọ bụla zutere ya, nye onye ọ bụla n'ime anyị nwere mmejọọ a na -ewepụsibeghị site na nwata nke mwakpo bụ ebumnuche ya. Anyị nwekwara ndekọ sitere na -mmegide anyị n'ụzọ ndị ọzọ na site na -eduhie. Mkpali ndị si na ya pụta nwere ike iweta mmetụta na –mgbagwoju anya, dị ka a na -emegbu mmadụ emegbu, na -ezobe ihe na -ezighi ezi, na mmadụ nwere obi ọjọọ, na ihe adịghị mma yana na anyị amaghị ihe na –eme’. Mmetụta ndị a nwere ike ime ka anyị ghara inwe ike iche echiche nke ọma maka ọnọdụ ahụ kama meghachi omume dabere na mmetụta ma gbalịa ka anyị pụọ n'ọnọdụ ahụ ngwa ngwa anyị nwere ike, ime ka à ga -asị na ọ nweghị ihe na -eme, ịghara ịkpọtụrụ onye ọ bụla metụtara ọnọdụ ahụ, ịkwado mwakpo ahụ, kpachara anya ma kewapụ onwe anyị n'ebe ọnye a wakporo nọ, ka anyị kpachara anya ma kewapụ onwe anyị na ọnye na -akwalite mwakpo ahụ, na ihe ndị ọzọ.

 Isoro mkpaliwe ndịahụ, anaghị enyere anyị ma ọbụ ọnọdụ anọ na ya aka kama ọ na –ebute mgbagwoju anya. Onye ọ bụla n'ime anyị kwesịrị inye ndụmọdụ maka mmetụta ndị echegharịrị echegharị, dị ka mmetụta, ma leghachi anya azụ wee tụgharịa uche n'ihe ndị mere n'oge gara aga nke tinyere ha. Mgbe ahụ anyị nwere ike ịga n'ihu na -eche maka otu anyị chọrọ inye aka dozie ọnọdụ ahụ.

Ikwado onye ana eme mwakpo

 Mgbe a na -ebuso mmadụ agha, ọ bụrụ na ahapụ naanị ya, ọ na -esiri ha ike ịwepụga ma chee echiche otu esi edozi ọnọdụ ahụ. Mmetụta ndị a na -akpalikarị na -agụnye inwe mmetụta ịnọ naanị ya, nghọtahie ya, megbu ya, ma gbahapụ ya. Onye ọ bụla n'ime anyị nwere ike wepụta mmetụta anyị na -agbagwoju anya ma kwado idozi ọnọdụ ahụ site n'ịkwado onye ahụ awakporo, yana onye ọ bụla ọ metụtara, ka ọ hapụ ya kama ime ihe na mmetụta ndị ọzọ.

 Ọ dị mkpa ịkwado onye a na -ebuso agha, ma ha emehiela ma ọ bụ na ha emeghị. Ozugbo akwụsịrị mwakpo ahụ mee ka ndị ọnọdụ ahụ metụtara kwupube ma wepụba iwe; enwere ike wepụta okwu mmejọ [lee ya anya] wee mee mgbazi ma ọ bụ rịọ arịrịọ mgbaghara. N'ime out ọgbakọ RC, anyị nwere nghọta, mkpokọta echiche, mmepụta mkpokọta echiche anyị, yana nkwudosị ike na ntụkwasị obi n'etiti onwe anyị ka ọrụ a wee ga n’iru na agbanyeghị nnukwu nkpalite ihe nsogbu.

Ọnọdụ ndị Ọha mmadụ

 Ọnọdụ di n’etiti ndị ọha mmadụ juputara na ihe isike na oke mmebi ihe. N'ime oge ugbu a, a na -ahụ nke ọma na oke ihe egwu na ọgbahara juru ebe n’ile. Ndị obodo enweghịkwa ike izochi ọtụtụ mmeso ọjọọ ha na nrigbu ha nke mmadụ na -enwechaghị ike mechie mmegide na -arịwanye elu nke ndị mmadụ na ihe na -aga n'ihu ka ọ dị ugbu a. Makana ndị mmadụ enwetela ihe mgbu nke ha enwebeghị ohere bupu ka ha nwere onwe ha, ụfọdụ ihe mgbachị ha na egosi na esite na mkpali iwe.

 Mgbe ụfọdụkwa ndị na -agbalị iwepụ mmegbu na -achọ ime ka ndị ọzọ na -agbalị ime otu ọrụ ahụ nweta ume ha. Nkea nwere ike ime na obere nghọtahie n'echiche ma ọ bụ enweghị nghọta. Mgbe ọ mere, akụkụ nke na agba mbọ imeri mmegbu enweta ndughie ụzọ. Ndị mmadụ ga egosi mkpalite iwe nke ga egosi na omume ha, ha nwere ike bido na -akwado ma na -eme mkpọsa iji mee ka ana ahụta ndị ọzọ na -arụ ọrụ n'otu ụzọ ahụ ịkwụsị mmegbu mmadụ niile ka ndị Ọjọọ.

 Mwakpo e mere dị ma ọ bụ ihe nwere ike ịdị, njikọ otu, ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọha na atụtụrụ mee ka ọ bawanye ọkachasị akwụkwọ akụkọ na mgbasa ozi dabere na ịntanetị. Na mgbasa ozi ndị a (nke na -enwekarị ebumnuche nke ha), a na -akọwahie ndị mmadụ na otu dị iche iche, na -ekwutọ ha, na eme ka ahụta ha ka mmụọ ọjọọ, na -enyeghị ohere nyochaa okwu ahụ akpụ n’ọnu. Nke a na -ekewa ndị mmadụ na otu ndị nwere ike na -arụkọ ọrụ ọnụ iji mee ka ọha mmadụ gaa n'ihu.

Mwakpo ndị ahụ na -echebe mmegbu dị adị, tinyere na mmụba ha site n'akwụkwọ akụkọ na mgbasa ozi ndị ọzọ na -erite uru naanị ndị nwere ike na ọhammadụ.

 Ịnwe obi mmadụ

  Iwakpo na ịchụpụ na -agbaghị mbọ ịghọta ọnọdụ na ozuzu oke bụ mmejọ. Mmehie ọ bụla dị mkpa ka amata, dozie ya, rịọ mgbaghara. Nkea ahụ bara ọ

nye ọ bụla uru. Mana ịkatọ na ịtụfu ndị mmadụ n'otu dị iche iche tinyere ọtụtụ afọ ọma ha, na ọrụ dị mkpa - n'ihi mmejọ, ohere nke mmejọ, ma ọ bụ mmejọ ha mere ogologo oge gara aga bụ ihe ga enyere aka mebie mbọ niile anyị na -agba iji kwụsị mmegide.

Mmejọ, mgbe echechara ya ihu ma mezie ya, ọ kacha mma ịhapụ ya ka ọ bụrụ ihe gara aga ebe ha mere. Ihe dị mkpa bụ etu ihe dị ugbu a na ebe anyị na -agbalị ịga. Echiche ndị mmadụ na amụma otu nwere ike ịmalite ma mee ka ihe kawanye mma ka oge na –aga yana ka ndị mmadụ na -arụkwu ọrụ ma na -amụtakwu ihe.

Ana m eche na ihe di ezi mkpa n’ijikwa mwakpo bụ inwe ezi obi mmadu yana adighị achugharị ndị iro kama jisike na ebupu ihe mwute k’anyị wee nwe ike iche echiche ma mesoo onye ọ bụla dịka mmadụ dịka o kwesiri. Nke a bụgodi mgbe ọtụtụ ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na -egosi etu ndụ ha siri dị njọ na ihe e lekwasịrị anya na ndụ ha niile site n'ichepụta nhụsianya agbakwunyere na anyị. Ime nke a bụ ohere nye ha ka ha ghara izo, gosi n'ụzọ zuru oke, ihe a manyere ha tachite obi ma dibe.

Ịpụta na ihea n'ọdịdị ka mma

 Ọ dị mkpa na nnọkọ ndụrịkọta ọdụ, na anyi ga ekpughe mkpali iwe anyị gbasara mwakpo ka enwere ike ịrụ ya ọrụ ka anyị ghara ịga n'ihu na-agbalị ịrụ ọrụ n'elu ha. Anyị kwesịrị inwe nnọkọ nwere nkwado zuru oke nke anyị nwere ike ileba anya n'ihe anyị ga -ejigide ebe anyị na -arụ ọrụ. Anyị nwere ike wepụta ihe ndị ahụ, ka ọgụ ijide ihe nkasi obi ghara ijupụta n'uche anyị.

 Anyị chọrọ iji ohere mwakpo ọ bụla (ọ bụ ezie na anyị agaghị enwe mmasị ibido ya) kwalite onwe anyị n'ihu, were na amụta ma na etokwa, ka anyị na -apụta n'ụdị [ọnọdụ] ka mma karịa ka anyị dị na mbụ.

 Anyị nwere ike iji ma wuo na ọrụ anyị bụ ndị otu RC rugoro na mpaghara a. Anyị nwere ike gụọ ma kpakọrịta amụma anyị debelụ maka ịkwado na idozi ndị ọchịchị. Nke a gụnyere amụma anyị nke bụ ịwere nsogbu wegara onye ahụ nsogbu metụtara ozugbo, kama ịkatọ ndị ọzọ maka ihe isi ike ahụ, yana ịnweta onye ntụnyere ga -enyere aka na usoro ahụ mgbe achọrọ ya. Anyị nwere ike ikpofu ihe ọ bụla mwakpo na akpalite ka anyị wee nwee ike ịchegharị echịche ijikwa ha. Anyị nwere ike ichetara onwe anyị na mmejọ anyị sitere na nhụjuanya anyị, na ọ bụghị ihe mgbakwasị ụkwụ maka mwakpo ma ọ bụ mmeso ọjọọ, na anyị nwere ike ihu ma rịọ mgbaghara maka mmejọ anyị ma buru ibu maka nsonaazụ ha. Anyị nwere ike, site na nkwado, wepụta nhụjuanya nke na -ebute mmejọ anyị, ka anyị ghara imehie otu ihe ahụ ọzọ. Anyị nwere ike ịkwado ibe anyị site na imezi mmejọ anyị wee gaa n'ihu ọnụ.

 Mwakpo ndị otu RC

 Otu ọgbakọ ndụrịkọta ọdụ nke bekee kpọrọ (Re evaluation Counselling) enwetela ọtụtụ mwakpo na iri afọ asaa ewubere ya. Ụfọdụ oge, ndị mmadụ nọ n’ime out ọgbakọ RC ejirila onye na-enye ndụmọdụ ọzọ nwee zee iwe mkpalite mwakpo nke ha, nke kpaliri ọtụtụ ndị ndụmọdụ ndị ọzọ. Dị ka otu ọgbakọ obodo, anyị ejirila nwayọọ nwayọọ na -eche nsogbu ndịa ihu, gba mbọ ikpofu ha, zụlite nghọta anyị banyere ha, wee wepụta ụzọ n'ime ntuziaka anyị iji mee ha. N'agbanyeghị nke ahụ, mwakpo ka na akpalighari ọtụtụ n'ime anyị mee mgbe ụfọdụ anyị na -ezere inyere ndị ọzọ nọ na ọgbakọ out anyị aka ileba okwua anya. Ya mere, mwakpo ka bụ isiokwu ọtụtụ n'ime anyị na ezere.

Ịgwa ndị abụghị ndị out RC okwu

Anyị nwere ike ịnyere ndị mmadụ na -abụghị ndị otu RC aka ndi anyị na ha na emekọrỊta ma na-ekwurịta ka ha nwee ezi nghọta banyere otu ọgbakọ RC, ka uche ha pụọ na ihe abughị eziokwu emere ka ha kwenye mgbe enwere mwakpo na mkpali iwe.  Anyị kwesịrị inye ndị mmadụ nkọwa kachasị mma nke eziokwu anyị nwere ike, kama iche na anyị ga -agbachitere RC. Ihe gbasara ịtugharị echịche ndukọrịta (Re evaluation Counselling) kwesịrị ka eme ka amara maka ya nke ọma ka ndị mmadụ nwe ohere ikpebi n’aka ha gbasara ya. Ndị mmadụ chọrọ enyemaka maka mkpali mmejọ, mana ha chọkwara ịnụ nke bụ eziokwu. Onye ọ bụla n'ime anyị nwere nkwenye maka RC na ọgbakọ otu RC nke sitere na mmekọ nke anyị. Nke a bụ ezigbo ozi anyị nwere ike inye ndị ọzọ. Ndị mmadụ nwere ike ịnụ ozi kacha mma ma o si n'ọnụ onye ha na ya nwere mmekọrịta. Nkwurịta okwu n’out n’out bụ ihe kacha mma iji gbubie mkpali. Ndị mmadụ nwere ike ịhụ echiche mmadụ ọzọ, na -agbalị iru ha. Nke ahụ ka mma karịa ịgụ akụkọ edere ede ma ọ bụ ibe weebụ. Ihe ndị dị otua nwere ike ịba uru, mana nkwenye anyị niile bụ na ndị mmadụ na -ege ntị ma ọ bụrụ na ha na ahụ mmadụ anya, na anụ ihe mmadu n’ekwu, ma na ahu ihe mmadụ ji bụrụ mmadụ na nkpakọrita ha.

 Na mgbakwunye, anyị nwere ike ịkekọrịta ndị mmadụ ebe nweta ozi n’ikuku (website) ọhụrụ anyị mepụtara, <listeningwell.info>, nke na -enye ozi ziri ezi gbasara RC. Ọ nwere ike inye ndị mmadụ ohere ịnweta ozi ziri ezi gbasara RC.

 

- - - -

 


Last modified: 2023-04-15 09:24:12+00